damnlyrics.com

Ihe Ndia Di Njo (These Things Are Bad) [English]

Verse 1:

Olu nke Chukwu na-ada n'ime obi si ''Nwam, ihe ndia di njo nwam, ihe ndia di njo ejesola ha nwam.'' Ma olu nke ekwensu na-ada n'ime nti si ''Nwam, ihe ndia di mma nwam, ekwela ha laa ezi nwam.''

CHORUS: ''Ihe ndia di njo'', Chukwu na-asi. ''ihe ndia di mma'', bu olu nke ekwensu. Ma ona-aka nyi uto inu nke ekwensu. Na isoro olu ya na-ekwu na-asi ''ihe ndia di mma, di mma, di mma, di mma, di mma.''

verse 2:

Mgbe anyi na-ewe ihe onye ozo Chukwu na-asi ''Nwam, ihe nkea di njo nwam, ihe nkea di njo, emekwala ya nwam.'' m'onye na-arafu anyi bu ekwensu na-asi ''Nwam, ihe nkea di mma nwam, oga emeba gi ezi nwam.'' Chorus

verse 3:

Mgbe anyi na-ejekwuru njo Chukwu na-asi ''Nwam, ihe nkea di njo nwam, ihe nkea di njo, ejesola ya nwam.'' Ma onye iro nke mmadu bu ekwensu na-asi ''Nwam, ihe nkea di mma nwam, jisi ike mee ya ezi nwam.'' chorus

verse 4:

Mgbe anyi na-ekwuto ekwuto Chukwu na-asi ''Nwam, ihe ndia di njo nwam, ihe ndia di njo, ekwukwala nnoo nwam.'' Ma onye na-emebi uwa bu ekwensu na-asi ''Nwam, ihe ndia di mma nwam, ha na-eweta onu(joy/happiness) ezi nwam. Chorus

Verse 5:

N'ime ekworo na ikpo asi chukwu na-asi ''Nwam, ihe ndia di njo nwam, ihe ndia di njo, na-ahukwa n'anya nwam.'' Ma onye nduhie nke uwa bu ekwensu na-asi ''Nwam, ihe nkea di mma nwam, anya lara anya(an eye for an eye) ezi nwam.chorus

Lyrics Submitted by Okeke Paschal Okechukwu

Enjoy the lyrics !!!