Nga Abu Udele (I Will Be a Vulture) [English] - Harcourt Whyte
| Page format: |
Direct link:
BB code:
Embed:
Nga Abu Udele (I Will Be a Vulture) [English] Lyrics
Mgbe Nga Abia Ózó:
By Harcourt Whyte
Mgbe nga abia ózó n’uwaa, nga abu udele.
Mmadu mbu n’ewe m iwe.
Mgbe nga abia ózó, agaghi m abu ókukó; ómu nnwa erighi aku nnwa.
Agaghi m abu nkita; ógbuputa orikwa ózó.
Agaghi m abu anu ulo, nke onyenwe ya huru n’anya. Ubuchi oriri daa ógbufuo ya rie.
Ihunanya nke uwaa enweghisi.
Mgbe nga abia ózó, nga abu udele onye nwe ahia.
Nga enwere onwe m karia mmadu.
Nga ebere n’ulo onyeukwu na onye nta.
Nri na anu unu ka m ga eburu n’atughi egwu.
Nga eje ebenile dika eze ma enweghi onye ga egbu m.
Mgbe nga abia ózó, nga abu udele. Ngaghi enwe enyi, ngaghi enwe onye iro.
Lyrics Submitted by J. Chiedozie Okwuadimma
Enjoy the lyrics !!!